Ndị Kọlọsị Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Pọl dere akwụkwọ a nʼoge e tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ na Rom nʼihi ikwusa oziọma. Nʼakwụkwọ a Pọl mere ya ka ọ pụta ìhè na Kraịst bụ isi ihe niile. Ọ kọwaara na ndụ juru afọ dị nʼime Kraịst, na onye nwere Kraịst nwezuru ihe niile. Ọ dọrọ ndị Kraịst aka na ntị sị ha ekwela ka e jiri ozizi ụgha si nʼamamihe mmadụ duhie ha. Ozizi banyere ibi ndụ dị ka onye Kraịst dịkwa nʼakwụkwọ a.Usoro e si dee ya:Ekpere Pọl 1:1-14Ịdị ukwuu nke Kraịst 1:15–2:5Ịdọ aka na ntị banyere ozizi ụgha 2:6-23Ibi ndụ nke onye Kraịst 3:1–4:6Okwu mmechi 4:7-13