Abụ Ọma 28 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 28Abụ Ọma Devid.Ekpere maka enyemaka na-ekele

1Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku;

gị bụ Oke nkume m,

agbala m nkịtị.

Ọ bụrụ na ị jụ ịza m,

aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.

2Nụrụ arịrịọ m maka ebere

dịka m na-akpọku gị maka enyemaka,

mgbe m chịlịri aka m abụọ elu

nʼEbe gị Kachasị Nsọ.

3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ,

tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe,

ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo,

ma ha bu iro nʼime obi ha.

4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha

na omume ha kwesiri;

kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,

ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.

5Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị,

ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ,

ọ ga-akwada ha nʼala,

ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.

6Toonu Onyenwe anyị,

nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.

7 Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;

ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.

Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,

aga m ejikwa abụ m na-eto ya.

8 Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya,

ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.

9Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị;

buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help