Ekiliziastis 6 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Ọ dị ihe ọjọọ ọzọ nke m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, nke na-anyịdo ụmụ mmadụ.

2Chineke na-enye mmadụ akụnụba, na ihe nnweta, na nsọpụrụ, na-emekwa ka ha nwee ihe niile ha chọrọ, ma ọ dịghị enye ha ike ịnụ ụtọ ha; ma onye ọzọ na-anụ ụtọ ha. Nke a bụ ihe efu, bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya.

3Mmadụ nwere ike mụta narị ụmụ, o nwekwara ike nwee ndụ ogologo ruo agadi, ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịnụ ụtọ akụnụba ya, ọ bụrụkwa na o nwetaghị ụdị olili ruru ya, ana m asị, na nwa nwụrụ nʼafọ dị mma karịa ya.

4Ọbịbịa ya e nweghị isi, nʼọchịchịrị ka ọ na-ala, ọ bụkwa ọchịchịrị ka e kpuchiri aha ya.

5Ọ bụ ezie na ọ gaghị ahụ ihe anwụ anya, ọ makwaghị ihe ọbụla, o nwere izuike karịa nwoke ahụ.

6A sịkwarị na o biri ndụ puku afọ, okpukpu abụọ, ma ọ nụghị ụtọ akụnụba ya. Ọ bụghị nʼotu ebe ka ha niile na-ala?

7Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ,

ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya.

8Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu?

Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenye

na ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?

9Ihe eji anya hụ

ka mma karịa oke ọchịchọ!

Nke a bụkwa ihe efu

na ịchụso ifufe.

10Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga.

Amakwaara ihe mmadụ bụ,

mmadụ ọbụla apụghị ịlụso

onye ka ya ike ọgụ.

11Okwu na-aba ụba,

nghọta na-adị nta.

O nwere uru nke a bara?

12Onye mara ihe dịrị mmadụ mma na ndụ, nʼụbọchị ole na ole nke na-abaghị uru o nwere ịgabiga ndụ a dịka onyinyo? Onye pụrụ ịgwa ya ihe ga-eme nʼokpuru anyanwụ, mgbe ọ nwụsịrị?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help