Joshua 12 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụọgụgụ ndị eze e meriri

1Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba.

2Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn.

Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya.

3Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga.

4Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei.

5Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn.

6Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.

7Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.

8Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus.

Ndị a bụ ndị eze ahụ:

9Eze Jeriko, otu

eze Ai (nke dị nso na Betel), otu

10eze Jerusalem, otu

eze Hebrọn, otu

11Eze Jamut, otu

eze Lakish, otu

12eze Eglọn, otu

eze Gaza, otu

13eze Debịa, otu

eze Geda, otu

14eze Homa, otu

eze Arad, otu

15eze Libna, otu

eze Adulam, otu

16eze Makeda, otu

eze Betel, otu

17eze Tapụọa, otu

eze Hefa, otu

18eze Afek, otu

eze Lasharọn, otu

19eze Madọn, otu

eze Hazọ, otu

20eze Shịmrọn Meron, otu

eze Akshaf, otu

21eze Teanak, otu

eze Megido, otu

22eze Kedesh, otu

eze Jokneam, nʼime Kamel, otu

23eze Doa, (nʼime obodo Naftod), otu

eze Goiim, nʼime Gilgal, otu

na

24eze Tịaza, otu.

Ha niile dị ndị eze iri atọ na otu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help