1Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel,
gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ.
Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim,
nwupụta Ìhè
2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase.
Kpọtee ịdị ike gị,
bịa zọpụta anyị.
3O Chineke, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
4O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ
megide ekpere ndị gị?
5I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri;
i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.
6I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị,
ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.
7O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
8I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị;
ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.
9Ị sụchaara ya ala,
mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
10Ndo ya kpuchiri ugwu niile,
alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.
11Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri
wasaakwa ume ya ruo osimiri.
12Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile
si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?
13Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya,
ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.
14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ!
Letakwa osisi vaịnị a,
15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ,
ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
16E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya;
mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.
17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị,
nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.
18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ;
tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
19Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike zọpụta anyị.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.