Abụ Ọma 97 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 97Chineke onye na-achị ihe niile

1 Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ;

ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.

2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu;

ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.

3Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya

ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.

4Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile;

ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.

5Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị,

nʼihu Onyenwe ụwa niile.

6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya;

ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.

7A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe,

ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee

feenụ ya ofufe, unu chi niile!

8Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ,

obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ

nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.

9Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile;

ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.

10Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị,

nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi

ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.

11Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume,

ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.

12Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume,

tookwanụ aha nsọ ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help