Abụ Ọma 141 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 141Abụ Ọma Devid.Arịrịọ nke ezi mmadụ

1O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ.

Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.

2Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ;

ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.

3Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị;

na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.

4Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ,

isonye ndị na-eme ihe ọjọọ

rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche;

ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.

5Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere;

ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m.

Isi m agaghị ajụ ya.

Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.

6A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha,

mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.

7Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala,

otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.”

8Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị

nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.

9Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri,

sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.

10Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha,

ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help