Izikiel Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Izikiel bụ otu nʼime ndị nchụaja a dọtara nʼagha mgbe ndị agha Babilọn lara Juda nʼiyi. Ọ bụ na Babilọn ka ọ nọ malite ọrụ dị ka onye amụma Chineke. O buru amụma kwuo na ikpe ọmụma ọzọ ga-abịakwasị ndị Juda ahụ fọdụrụ na Jerusalem. Ma ndị Juu ya na ha nọ na Babilọn jụrụ ịnabata amụma o buru. Nʼikpeazụ, amụma ahụ o buru banyere Jerusalem mezuru (lee anya nʼisi 33:21), nʼihi ya, ndị Juu ibe ya malitere ịṅa ya ntị. Chineke sitere nʼọnụ ya gbaa ha ume, gosi ha na olileanya dị, na ha ga-emesịa lọghachikwa nʼala nke aka ha. Akwụkwọ Izikiel na-egosi ihe abụọ banyere Chineke, onye dị nsọ. Nke mbụ, ọ na-egosi na Chineke aghaghị ikpe ajọ omume ikpe. Nke abụọ, ọ na-egosi na ikwesi ntụkwasị obi Chineke na-adịgidere ndị niile na-ejezi ije dị ka iwu ya na ụkpụrụ ya si dị.Usoro e si dee ya:Ọkpụkpọ Izikiel 1–3

Amụma megide Izrel na Jerusalem 4–24

Amụma megide mba dị iche iche 25–32

Nkwa nlọghachi nke ndị a dọtara nʼagha 33–39

Ụlọnsọ ukwu dị nʼalaeze Chineke 40–48

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help