Abụ nke Abụ 7 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ

gị ada nwa eze.

Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa,

ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka.

2Otubo gị mara mma

dịka iko nke a gbajuru mmanya.

Ukwu gị dị ka ukwu ọka

e ji okoko urodi gbaa gburugburu.

3Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ

nke otu nne mụrụ nʼotu oge.

4Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo.

Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn

nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim.

Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn

nke chere Damaskọs ihu.

5Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel.

Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo.

Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha.

6Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma.

Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya.

7Ị dị ogologo dịka osisi nkwụ;

ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ osisi.

8Ekwuru m sị, “Aga m arịgoro elu osisi nkwụ ahụ,

jidekwa mkpụrụ ya aka.”

Ugbu a, ka ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị,

ka isisi nke iku ume gị dịkwa ka mkpụrụ osisi apụl,

9ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma.

Onye a hụrụ nʼanya

Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya,

na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.

10Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya,

ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.

11Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo,

ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.

12Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi

lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru,

ma okoko ya agbawaala,

ma osisi pomegranet agbawaala okoko.

Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m.

13Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nụ isi nke mandreki na-ewepụta;

mkpụrụ osisi niile na-atọ ụtọ ga-adịkwa nʼọnụ ụzọ anyị,

ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie,

nʼihi na edokọtaala m ha maka onye m hụrụ nʼanya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help