Abụ Ọma 29 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 29Abụ Ọma Devid.Olu Onyenwe anyị

1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe,

nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.

2Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;

kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.

3Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri;

olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,

olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri.

4Olu Onyenwe anyị dị ike,

olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.

5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;

Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.

6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,

ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ.

7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe

mgbe amụma na-egbu.

8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;

Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.

9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ

na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.

Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”

10 Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri;

Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.

11 Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike,

ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help