Abụ Ọma 61 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 61Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ.Ekpere nke onye nọ na nsogbu

1Nụrụ akwa m, O Chineke,

gee ntị nʼekpere m.

2Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,

ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba;

duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.

3Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m,

na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.

4Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi,

ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela

5Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere;

i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.

6Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze,

mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.

7Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;

zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.

8Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi.

Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help