2 Ihe E Mere Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ Ihe e mere nke abụọ kọrọ akụkọ ihe mere nʼala Juda. Ọ malitere akụkọ a nʼebe Akwụkwọ Ihe e mere nke mbụ kwụsịrị. A kọrọ akụkọ banyere ịdị ebube nke ọchịchị Solomọn, eze Izrel, kọọkwa ihe gbasara ịdị ebube nke ụlọnsọ ukwu. A kọkwara akụkọ banyere ihe mere nʼoge ndị eze Juda ndị ọzọ chịrị, rụtụ aka nʼihe gbasara ọnọdụ ife ofufe dị iche iche nʼoge ọchịchị eze ndị a. A kpọtụrụ Hezekaya bụ eze aha, nye ya ọnọdụ pụrụ iche nʼakwụkwọ a nʼihi na ọ bụ nʼoge ọchịchị ya ka enwere ntute dị ukwuu nʼala Juda. Akụkọ ọzọ a kọrọ nʼakwụkwọ a metụtara mbibi e bibiri Jerusalem, na ndọta nʼagha nke ndị agha Babilọn dọtara ndị Juda. Ihe e ji mechie akwụkwọ a bụ akụkọ banyere iwu nke eze ndị Peshịa nyere maka ịhapụ ndị Juda a dọtara nʼagha ka ha laghachi nʼala ha.Usoro e si dee ya:Ọchịchị Solomọn 1

Owuwu na ido ụlọnsọ ukwu nsọ 2–7

Ịdị ebube nke ọchịchị Solomọn 8–9

Ndị eze ndị ọzọ chịrị na Juda 10–36

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help