2 Timoti Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Pọl nọ nʼụlọ mkpọrọ mgbe o dere akwụkwọ a. Ndị ọkachamara akwụkwọ nsọ chịkọtara aka kwuo na Timoti nke abụọ nwere ike bụrụ akwụkwọ ikpeazụ Pọl dere tupu e gbuo ya nʼihi okwukwe ya, na nʼihi ọrụ nkwusa oziọma ya. Nʼakwụkwọ a Pọl gosiri mkpa ọ dị na onye Kraịst ọbụla ga-ejidesi eziokwu dị nʼoziọma ahụ aka ike. Ọ kọwara na oge na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ige ntị nʼihe akwụkwọ nsọ kwuru. Nʼihi ya o kwesiri ka Timoti nọgidesie ike nʼekwusa oziọma ahụ nʼọnọdụ ọbụla.Usoro e si dee ya:Ekele Pọl nʼisi Timoti 1:1-5Iwu Pọl nyere Timoti 1:6-18Odibo kwesiri ntụkwasị obi 2Ekweghị ekwe nke oge dị nʼihu 3:1-9Okwu mmechi 3:10–4:22