Jeremaya 22 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ikpe ọmụma dịrị ndị eze ọjọọ

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a.

2‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa.

3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.

4Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị.

5Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ”

6Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda,

“Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m,

dịka elu ugwu ukwu Lebanọn,

aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa,

dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.

7Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị.

Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya.

Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile,

tụnye ha niile nʼime ọkụ.

8“Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’

9Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”

10Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu,

kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ.

Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ;

ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.

11Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.

12Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.”

13“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume,

nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile,

onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu,

nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.

14Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu,

nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’

Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ,

jirikwa osisi sida machie elu ya,

werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma.

15“Ị ga-abụ eze

nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ?

Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?

O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi

nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.

16O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa,

nke a mere na ihe niile gara nke ọma.

Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m?

Ka Onyenwe anyị kwupụtara

17Ma anya unu na obi unu

adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi

nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha,

na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”

18Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda:

“Ha agaghị eruru ya uju sị,

‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’

Ha agaghị eruru ya uju sị,

‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’

19A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu.

A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya

nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”

20“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa,

meenụ ka a nụ olu unu na Bashan,

sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa

nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.

21Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm,

ma ị jụrụ ige ntị.

Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị.

Ị jụkwara irubere m isi.

22Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile,

a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ.

Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala

nʼihi ajọ omume gị niile.

23Gị onye na-ebi na Lebanọn,

onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo,

lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị,

ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.

24“Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,

25were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.

26Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.

27Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”

28Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị,

ihe onye ọbụla na-achọghị?

Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya,

tụga ha na mba ha na-amaghị?

29Ala, ala, ala,

nụrụ okwu Onyenwe anyị.

30Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru:

“Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa,

nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile,

nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma,

o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid,

maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help