Job 35 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Mgbe ahụ, Elihu sịrị:

2“Ị na-eche na nke a ziri ezi?

Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’

3Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m,

gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’

4“Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị,

zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.

5Lelie anya na eluigwe ma hụkwa.

Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.

6Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya?

Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?

7Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya,

maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?

8Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị,

ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.

9“Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu,

ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.

10Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ,

onye na-enye abụ nʼime abalị,

11onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa,

onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’

12Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa,

nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.

13Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha;

Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.

14Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị

mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya,

na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya

na ị ga-anọkwa na-eche ya!

15Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ,

nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.

16Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe;

ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help