Ilu 20 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ.

Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.

2Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm;

ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.

3Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka,

ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.

4Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya.

Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.

5Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi,

ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.

6Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ,

ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?

7Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke,

ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.

8Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe,

ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.

9Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha;

Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?”

10Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu,

ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.

11Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile,

nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?

12Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ,

ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.

13Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa.

Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.

14“Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị,

ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.

15Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba,

ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.

16Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe.

Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.

17Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ.

Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.

18Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime;

ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.

19Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị,

nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.

20Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya

ka Chineke na-afụnyụ.

21Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ,

agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.

22A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.”

Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.

23 Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị,

ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.

24 Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ.

Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?

25Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya

ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.

26Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume,

ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.

27Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya,

ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.

28Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze,

site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.

29Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha,

ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.

30Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ,

ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help