Ọrụ Ndị Ozi 22 - Igbo Contemporary Bible 2020

1“Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nʼihu unu.”

2Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nʼasụsụ Hibru, ha deere duu karịa.

Mgbe ọ sịrị,

3“Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nʼime Silisia. Azụrụ m na obodo a nʼụkwụ Gamaliel onye nkuzi m. Anatara m ọzụzụ dị ike na ịsọpụrụ iwu nke nna nna anyị ha ejikwa m ịnụ ọkụ nʼobi na-efe Chineke dịka unu niile si eme taa.

4Akpagburu m ndị niile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nʼaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nʼụlọ mkpọrọ.

5Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.

Akụkọ nchegharị Pọl

6“Nʼetiti ehihie, mgbe m na-aga nʼụzọ, nʼebe dị Damaskọs nso, oke ìhè nke si nʼeluigwe, chara gburugburu m.

7Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’

8“ ‘Onye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ.

“Ọ sịrị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-akpagbu.’

9Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.

10“Asịrị m, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’

“Onyenwe anyị sịrị m, ‘Bilie banye Damaskọs; nʼebe ahụ a ga-agwa gị ihe niile a kwadobere na ị ga-eme.’

11Nʼihi na-enweghị m ike ịhụ ụzọ nʼihi ebube ìhè ahụ chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nʼaka bata na Damaskọs.

12“Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ.

13Ọ bịakwutere m, guzoro nʼakụkụ m sị, ‘Nwanna anyị Sọl, ka emee ka ị hụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ, e nwetara m ike ịhụ ụzọ, m hụkwara ya.

14“Mgbe ahụ, ọ sịrị, ‘Chineke nke nna nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ na ịnụta okwu site nʼọnụ ya.

15Ị ga-abụ onyeama ya nye ndị niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.

16Ma ugbu a, gịnị ka ị na-eche? Bilie ọtọ, ka e mee gị baptizim, ka a sachakwa gị site na mmehie, na-akpọkukwa aha ya.’

Pọl onyeozi nye ndị mba ọzọ

17“Mgbe m lọghachikwara na Jerusalem, nọrọ na-ekpe ekpere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ahụrụ m ọhụ,

18ebe ọ na-agwa m, ‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nʼihi na ndị bi nʼala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere m.’

19“Ma asịrị m, ‘Onyenwe anyị, ndị a maara nke ọma na m na-aga nʼụlọ nzukọ nʼotu nʼotu, na-atụba ndị kwere na gị nʼụlọ mkpọrọ, na-etikwa ha ihe.

20Nʼoge a na-awụfu ọbara onyeama gị bụ Stivin, eguzo m nso na-akwado nʼihe emere dị mma, ma na-elekọtakwa uwe ndị ahụ tụgburu ya anya.’

21“Mgbe ahụ, ọ sịrị m, ‘Gawa; nʼihi na aga m ezipu gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ.’  ”

Pọl onye Rom

22Ha ṅara ya ntị ruo ugbu a. Mgbe ahụ, ha niile tiri mkpu nʼotu olu sị, “Wepụnụ onye dị otu a nʼụwa! O kwesighị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”

23Ha tiri mkpu na-atụli uwe mgbokwasị ha elu, na-achilikwa aja nʼala na-efesasị ya ebe niile,

24ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpụgaa ya nʼogige ndị agha, pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nʼọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ha ji eti mkpu otu a megide ya.

25Ma mgbe ha chịịrị ụdọ akpụkpọ kechaa ya, Pọl sịrị onye agha guzo ya nso, “Ọ bụ ihe ziri ezi nʼiwu na unu ga-eti nwa afọ Rom ihe, onye na-enweghị ikpe a mara ya?”

26Mgbe onye agha a nụrụ okwu a, o jekwuuru ọchịagha ahụ sị, “Gịnị ka ị na-aga ime? Nwoke a bụkwa onye Rom.”

27Ọchịagha ahụ bịakwutere sị ya, “Gwa m, ị bụ onye Rom?”

Ọ sịrị, “E.”

28Ọchịagha ahụ zara, “ma o furu m ego dị ukwuu iji bụrụ onye Rom.”

Ma Pọl sịrị, “Amụrụ m dịka nwa afọ ala a.”

29Ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ mere ngwangwa wezuga onwe ha. Egwu tụkwara ọchịagha nʼonwe ya mgbe ọ matara na ọ bụ nwa afọ Rom, nʼihi na o keela ya rịị agbụ na mbụ.

Pọl nʼihu ndị ikpe

30Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help