Abụ Ọma 23 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 23Abụ Ọma Devid.Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ

1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.

2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,

ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,

3ọ na-atụte mkpụrụobi m.

Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume

nʼihi aha ya.

4A sịkwarị na m na-aga ije,

na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,

agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;

nʼihi na ị nọnyeere m,

mkpọrọ gị na mkpanaka gị

na-akasị m obi.

5Ị na-akwado tebul nʼihu m,

nʼanya ndị iro m.

I tere isi m mmanụ

iko m na-ejubiga oke.

6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m

ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,

m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị

mgbe niile ebighị ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help