2 Ndị Kọrint Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Akwụkwọ mbụ Pọl deere chọọchị dị na Kọrint ezughị idozicha nsogbu niile dị na nzukọ ahụ. Nʼihi ya, Pọl dekwara akwụkwọ a. Ọkpụrụkpụ okwu pụtara ihe nʼakwụkwọ a metụtara na Pọl esoghị bụrụ otu nʼime ndị ikom iri na abụọ ahụ ha na Jisọs yikọrọ, nʼihi ya, ha kwuru na Pọl enweghị ike ikwuchite ọnụ Kraịst. Ma nʼakwụkwọ a, Pọl gosiri na ya bụ onye na-ekwu ọnụ Kraịst nʼezie, nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya họpụtara ya ịrụ ọrụ a. Ozizi ndị ọzọ dị iche iche dịkwa nʼakwụkwọ a.Usoro e si dee ya:Ekele mmalite 1:1-11Ntakịrị okwu banyere ndụ Pọl 1:12–2:13Ije ozi nke onye Kraịst 2:14–6:13Ịhụnanya Pọl nʼebe ndị Kọrint nọ 6:14–7:16Onyinye maka ndị ogbenye 8–9Nhọpụta Pọl dị ka onye na-ekwu ọnụ Kraịst 10:1–13:10Ekele ikpeazụ 13:11-14