Abụ Ọma 22 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 22Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid.Akwa na abụ ekele

1Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?

Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m,

nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?

2O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m,

nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.

3Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ;

ị bụ otuto ndị Izrel.

4Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi;

ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.

5Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara;

ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.

6Abụ m idide, abụghị m mmadụ;

onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.

7Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;

na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.

8“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi;

ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya.

Ya napụta ya ebe ọ bụ

na ihe ya masịrị ya.”

9Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.

Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.

10Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.

Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.

11Anọla m ebe dị anya,

nʼihi na nsogbu dị nso.

Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.

12Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;

oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.

13Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa

asaghepụla ọnụ ha megide m.

14A wụpụla m dịka mmiri,

ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.

Obi m agbazela dịka mmanụ,

obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.

15Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.

Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,

nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.

16Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;

otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu,

ha adupuola m aka m na ụkwụ m.

17A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;

ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị

18Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,

ha sitere nʼife nza kee uwe m.

19Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya;

gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.

20Napụta ndụ m site na mma agha,

site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.

21Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a,

zọpụta m site na mpi atụ ndị a.

22Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m;

nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.

23Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya;

unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya!

Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!

24Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya

maọbụ kwaa ya emo;

o lefughị ya anya

kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.

25Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị;

aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.

26Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,

ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya

ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,

ma laghachikwute Onyenwe anyị.

Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche

ga-akpọ isiala nʼihu ya.

28Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,

ọ na-achịkwa mba niile.

29Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;

ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya;

ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.

30Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;

a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.

31Ha ga-ekwusa ezi omume ya

nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị

nʼihi na o meela ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help