Abụ Ọma 131 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 131Abụ nrigo, nke Devid.Abụ nke ndị dị nwayọọ nʼobi

1O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m,

ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;

adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m

maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.

2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;

dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,

e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.

3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị

ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help