Jeremaya 12 - Igbo Contemporary Bible 2020

Mkpesa Jeremaya

1Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị,

mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị.

Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị:

Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma?

Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla?

2Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ;

ha na-etokwa na-amị mkpụrụ.

Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha,

ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.

3Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị;

ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị.

Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu.

Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha.

4Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ?

Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ?

Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị

nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu.

Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị,

“Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.”

Ọsịsa Chineke nyere

5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ

emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara,

i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi?

Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị,

ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?

6Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị,

ararala gị nye.

Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị.

Atụkwasịla ha obi,

ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị.

7“Aga m agbakụta ụlọ m

na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ.

Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya

nyefee ya nʼaka onye iro ya.

8Ihe nketa m aghọrọọla m,

ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa,

Ọ na-agbọ ụja megide m;

ya mere, m ji kpọọ ya asị.

9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị

nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m

nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya?

Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile,

mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.

10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m.

Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ,

ha emeela ka ubi m mara mma

ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.

11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu;

e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m.

Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,

nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.

12Ndị mbibi ga-ejupụta

nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara,

nʼihi na mma agha Onyenwe anyị

ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya.

O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ.

13Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha.

Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla.

Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu,

nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.”

14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda.

15Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.

16Ọ bụrụkwa na ha amụta ụzọ niile nke ndị m nke ọma, na iji aha m ṅụọ iyi, na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ dịka ha si kuziere ndị m iji aha Baal na-aṅụ iyi, aga m eme ka ha guzosie ike nʼetiti ndị m.

17Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ajụ ige ntị, aga m ehopu ha kpamkpam, laa ha nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help