Abụ Akwa 2 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya

kpuchie ada Zayọn!

O sitela nʼeluigwe

tụda ịma mma Izrel nʼala,

o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya,

nʼụbọchị iwe ya.

2Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb;

na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ.

O sitela nʼoke iwe ya

dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda.

Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala,

mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ.

3O sitela nʼoke iwe ya

bipụ ike niile Izrel nwere.

O seghachiri aka nri ya,

mgbe ndị iro ha na-abịa nso.

O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb;

si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya.

4O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya,

dịka onye iro.

Dịka onye iro kwa

o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya;

ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ,

nʼelu ụlọ ada Zayọn.

5Onyenwe anyị dị ka onye iro,

o lomichaala Izrel.

O lomichaala ụlọeze ya niile,

bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike.

O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa

mụbaara ada Juda.

6O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige;

o bibiela ebe nzukọ ya niile.

Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ

ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ.

Site nʼoke iwe ya,

ọ jụla eze na onye nchụaja.

7Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya

gbakụta ebe nsọ ya azụ.

O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya

nyefee nʼaka onye iro;

ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị

dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.

8 Onyenwe anyị ekpebiela ibibi

mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu.

O setịpụrụ ihe ọtụtụ;

o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya.

O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ,

meekwa ka ha richapụsịa.

9Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala;

ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi.

A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ.

Iwu adịghịkwa,

otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ

site nʼebe Onyenwe anyị nọ.

10Ndị okenye ada Zayọn

nọ ọdụ nʼala, dere duu.

Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha;

ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe.

Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke

ehulatala isi ha nʼala.

11Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa,

ime ime ahụ m na-anụ ọkụ.

Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala,

nʼihi na e bibiela ndị m,

nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba

nʼokporoụzọ nke obodo.

12Ha na-ebere nne ha akwa na-asị,

“Olee ebe ọka na mmanya dị?”

Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ

nʼokporoụzọ obodo,

mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha

nʼaka nne ha ku ha.

13Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị?

Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị,

gị ada Jerusalem?

Gịnị ka m ga-asị na i yiri,

nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi,

gị ada Zayọn na-amaghị nwoke?

Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri.

Onye pụrụ ịgwọ gị?

14Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ

bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi.

Ha ekpugheghị mmehie gị,

igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị.

Kama ihe ha hụtaara gị

bụ ihe ụgha na nduhie.

15Ndị niile si nʼebe ị nọ

na-agafe na-akụrụ gị aka ha;

ha na-efufe isi ha,

jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị.

Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ

a na-akpọ ebe mabigara mma oke,

ọṅụ nke ụwa niile?”

16Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha

megide gị;

ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze.

Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya.

Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya.

Anyị adịrịla ndụ hụ ya.”

17 Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime.

O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime

site nʼoge gara aga.

Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla.

O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị;

o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.

18Obi ndị mmadụ

na-etiku Onyenwe anyị.

Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn,

ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri

ehihie na abalị niile,

enyekwala onwe gị izuike,

enyekwala anya gị izuike.

19Bilie, kwaa akwa nʼabalị,

nʼoge mmalite nche abalị.

Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị

dịka ọ bụ mmiri.

Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị

nʼihi ụmụntakịrị ndị a,

ndị na-ada nʼihi agụụ

nʼisi okporoụzọ niile.

20“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị.

Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso?

O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha,

bụ ụmụ nke ha mụrụ?

O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma

nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?

21“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe,

nʼuzuzu nke okporoụzọ.

E jirila mma agha gbuo

ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m.

I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị;

i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.

22“Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri,

otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile.

Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị

ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ;

ndị m lekọtara, zụlitekwa

ka ndị iro m lara nʼiyi.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help