Ndị Rom Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Pọl degaara nzukọ Kraịst nọ na Rom akwụkwọ a iji kọwaa Oziọma Kraịst. Nʼakwụkwọ a, anyị ga-achọpụta otu onye mmehie ga-esi bụrụ onye Chineke ga-anabata, chọpụtakwa otu onye Chineke nabatara, ma zọpụtakwa, ga-esi jezie ije dị ka Chineke chọrọ. A kọwaara anyị ihe ijikọta Kraịst na mmadụ ọnụ nʼotu pụtara, kọwaakwa uru dịrị ndụ nke ime mmụọ anyị, bụ nke ụdị njikọta a bara. A kọwara ihe butere ọdịda nke ụmụ Izrel na olileanya dịịrị ha maka nzọpụta Chineke nʼoge dị nʼihu.Usoro e si dee ya:Nkọwa nke mmalite 1:1-17

Mmehie na nzọpụta na-adị site nʼokwukwe 1:18–5:21

Mmeri na-adị site nʼike Kraịst 6–8

Nzube Chineke maka ndị Juu 9–11

Ijezi ije dị ka onye nke Kraịst 12:1–15:13

Okwu ikpeazụ 15:14–16:27

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help