Ndị Kọlọsị 4 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Unu ndị nwe odibo, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na ikpe ziri ezi na-emeso ndị ohu unu omume, ebe unu maara na unu onwe unu nwere onyenwe unu nʼeluigwe.

Ndụmọdụ ndị fọdụrụ

2Na-anọgidenụ nʼekpere, nọọkwanụ na nche na-enyekwanụ ekele.

3Na-echetakwanụ anyị nʼekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa oziọma, ka anyị nwee ike kwusaa ihe omimi Kraịst, nke m ji maka ya nọrọ nʼụlọ mkpọrọ,

4ka m nwee ike kwuo ya ka o doo anya otu m kwesiri.

5Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma.

6Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.

Ekele ikpeazụ

7Taịkikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesikwara ntụkwasị obi, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nʼọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe niile banyere m.

8Ana m ezitere unu ya, ka unu mara ihe banyere ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa obi unu ume.

9Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesiri ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nʼime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe niile na-eme nʼebe a.

10Arịstakọs, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne Banabas na-ekelekwa unu. (Onye unu natara ihe ntụziaka banyere ya, ọ bụrụ na ọ bịarute nʼebe unu nọ, unu nabata ya nke ọma.)

11Jisọs, onye a na-akpọkwa Jọstus, na-ekelekwa unu. Ọ bụ naanị ndị a bụ ndị Juu mụ na ha na-arụkọ ọrụ alaeze Chineke nʼebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ.

12Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nʼime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge niile ka ọ na-ekpe ekpere nʼihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike bụrụ ndị tozuru etozu na ndị kwesiri ike nʼọchịchọ niile nke Chineke.

13Ana m agbara ya akaebe na ọ rụsịrị ọrụ ike nʼihi unu na nʼihi ndị Laodisia na ndị Hierapolis.

14Ezi enyi anyị Luk, onye dibịa ukwu anyị na Dimas na-ekele unu.

15Keleerenụ m ụmụnna anyị bi na Laodisia na nwanna anyị Nimfas na chọọchị na-ezukọ nʼụlọ ya.

16Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ dị na Laodisia. Gụọkwanụ nʼotu mgbe ahụ akwụkwọ nke si na Laodisia bịa.

17Gwanụ Akipos ka ọ kpachapụ anya rụchaa ọrụ Onyenwe anyị nyere ya ịrụ.

18Eji m aka m dee ekele nke a mụ onwe m bụ Pọl. Unu echefula na m nọ nʼagbụ. Ka amara dịnyere unu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help