Abụ Ọma 122 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 122Abụ nrigo, nke Devid.Ekpere maka udo Jerusalem

1Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m,

“Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”

2Ụkwụ anyị eguzola ugbu a

nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.

3E wuru Jerusalem dịka obodo

a chịkọtara ọnụ nke ọma.

4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo,

bụ ebo niile nke Onyenwe anyị,

ịbụku aha Onyenwe anyị abụ

dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.

5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị,

bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.

6Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem:

“Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.

7Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile

nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”

8Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m,

ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”

9Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị,

aga m achọ ọganihu gị.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help