Job 5 - Igbo Contemporary Bible 2020

1“Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị?

Ole ndị dị nsọ ị ga-agbakwuru?

2Oke iwe na-egbu onye nzuzu,

ekworo na-egbu onye na-enweghị uche.

3Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ,

mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ.

4Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị,

a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha.

5Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi;

ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu;

akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso.

6Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta,

ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite.

7Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu,

dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu.

8“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke;

ya ka m ga-akọsara ihe niile.

9Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta,

ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.

10Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo,

ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.

11Ọ na-ebuli ndị dị ala elu,

na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha.

12Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ,

ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere.

13Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile,

mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ.

14Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie,

nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị;

15Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ,

ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike.

16Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya,

ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya.

17“Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị;

ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile.

18Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha;

Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.

19Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii,

mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa.

20Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ;

chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha.

21Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị.

Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.

22Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi,

ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche.

23Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ,

gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo.

24Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo;

ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu.

25Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ,

matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala.

26Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi,

dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru.

27“Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu.

Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị.”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help