1Ezi aha ka mma karịa mmanụ isi ụtọ.
Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.
2Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụ
karịa ebe a na-eri na-aṅụ.
Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla;
ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.
3Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma,
ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka
4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ,
ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.
5Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihe
karịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.
6Ọchị onye nzuzu
dị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.
Ihe a bụkwa ihe efu.
7Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu,
iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.
8Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya!
Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!
9Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ,
nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.
10Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?”
Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.
11Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma.
Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.
12Amamihe bụ ndo
dịka ego si bụrụkwa ndo,
ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a:
Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.
13Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme.
Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie,
bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?
14Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma,
ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma
na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma
makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ.
Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta
ọdịnihu ya.
15Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a;
onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya,
ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.
16Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke,
emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke.
Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?
17Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke,
abụkwala onye nzuzu!
Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?
18Ọ dị mma ijide otu
na-esepụghị aka na nke ọzọ,
onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.
19Amamihe na-eme ka otu onye dị ike
karịa mmadụ iri na-achị otu obodo.
20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume,
ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.
21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu,
ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.
22Gị onwe gị maara
na ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.
23Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị,
“Aga m abụ onye amamihe,”
ma nke a karịrị m.
24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu;
ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?
25A tụgharịrị uche m ka m ghọta,
iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dị
na ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omume
na ịyị ara nke dị na enweghị uche.
26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ,
ihe ahụ bụ nwanyị.
Obi ya dị ka ụgbụ.
Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe.
Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ,
ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.
27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru:
“Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.
28Mgbe m ka na-achọ
ma achọtaghị m,
nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha,
ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.
29Achọpụtara m naanị nke a,
Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi,
ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.