Abụ Ọma 1 - Igbo Contemporary Bible 2020

Nchịkọta Akwụkwọ nke mbụ Abụ Ọma 1–41Abụ Ọma 1Onye ihe na-agara nke ọma

1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,

onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;

onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie

maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.

2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.

Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,

3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya,

nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ.

Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.

4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a.

Ha dị ka igbugbo ọka

nke oke ifufe na-efesasị.

5Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe;

ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.

6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche.

Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help