Matiu Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Matiu bụ otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ Kraịst. Ihe o dere nʼakwụkwọ a bụ ihe ndị ahụ ọ hụrụ anya, na nke o ji ntị ya nụ. Ọkpụrụkpụ okwu Matiu ji mere isi akụkọ dị nʼakwụkwọ a bụ Alaeze Chineke, ya na ihe niile Jisọs Kraịst ziri banyere ya.Ihe Matiu bu nʼobi mgbe o dere akwụkwọ a bụ igosi na Jisọs Kraịst bụ onye mezuru ihe niile e buru nʼamụma nʼAgba Ochie banyere ya.Usoro e si dee ya:Ọmụmụ Kraịst na mmalite ije ozi ya 1–4Ozizi banyere alaeze Chineke 5–7Ozizi ndị ọzọ, na ilu dị iche iche 8–18Ụzọ Jerusalem 19–23Amụma banyere oge dị nʼihu 24–25Ọnwụ na mbilite nʼọnwụ 26–28