Aịzaya 64 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala,

ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!

2Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi,

na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ.

Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị,

meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.

3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya

ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.

4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ,

ọ dịbeghị ntị ghọtara,

o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị,

onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.

5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka,

bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha.

Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha,

iwe were gị.

A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?

6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ,

ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi.

Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi,

mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.

7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ;

ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị.

Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ,

meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.

8Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị.

Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite.

Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.

9Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe;

echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.

Biko, lekwasị anyị anya

nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.

10Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara;

ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu.

11Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe,

abụrụla ihe a gbara ọkụ.

Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.

12Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike?

Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help