1O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike;
i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
2I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya;
mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
3I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike;
i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
4Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ
nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. Sela
5Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
6Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
7Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m;
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m.
8Moab bụ efere ịkwọ aka m,
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm;
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
9Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?
Onye ga-edu m gaa Edọm?
10Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị,
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
11Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
12Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.