Abụ Ọma 72 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 72Abụ nke Solomọn.Ekpere maka eze

1O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.

Nyekwa nwa eze ezi omume gị.

2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,

jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.

3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;

ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.

4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,

zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;

ọ ga-egwepịa onye mmegbu.

5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,

dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.

6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,

dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.

7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;

ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.

8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,

na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa

9Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya,

ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.

10Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya,

ga-atụ ụtụ wetara ya;

e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba,

ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.

11Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya,

mba niile ga-ejekwara ya ozi.

12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.

Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.

13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,

ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.

14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,

nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.

15Ka ọ dị ogologo ndụ!

Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.

Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,

ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.

16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;

ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.

Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;

ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.

17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.

A ga-esite na ya gọzie mba niile,

a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.

18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,

onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.

19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;

ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.

Amen na Amen.

20Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help