Ilu 25 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ilu ndị ọzọ nke Solomọn

1Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.

2Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu,

ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.

3Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala,

otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.

4Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha,

onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;

5wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze,

ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.

6Egosipụtala onwe gị nʼihu eze,

ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,

7ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,”

karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ.

Ihe iji anya gị abụọ hụ

8e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe,

nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ

ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?

9Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu,

emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,

10ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere,

agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.

11Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi

dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.

12Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma

ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.

13Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ,

dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ

nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.

14Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere

dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.

15Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri,

nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.

16Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ?

Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.

17Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe,

ka ị ghara ire ugwu gị.

18Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha,

dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.

19Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe,

maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.

20Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ,

maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya,

otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.

21Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie,

ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.

22Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya,

Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.

23Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo,

otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.

24Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ

karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.

25Oziọma e sitere na mba dị anya nata

dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.

26Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru

dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.

27Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ,

otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.

28Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya

dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help