Ilu 5 - Igbo Contemporary Bible 2020

Ịdọ aka na ntị banyere ịkwa iko

1Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m,

gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a.

2Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche,

ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma.

3Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,

okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ.

4Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu

dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.

5Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,

nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ.

6Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;

ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.

7Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,

unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu.

8Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!

Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,

9ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,

maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.

10Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,

ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ.

11Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ

mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị.

12Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!

“Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya!

13Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m

maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m.

14Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi

nʼihu ọha mmadụ niile.”

15Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;

mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị.

16Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,

ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama?

17Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,

nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya.

18Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;

ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.

19Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,

ka ara dị ya nʼobi zuore gị,

ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.

20Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?

Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?

21Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya,

ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ.

22Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi;

mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya.

23Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị;

ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help