Abụ Ọma 123 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 123Abụ nrigo.Ekpere maka ebere

1Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị,

gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.

2Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya,

na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje,

otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya,

ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.

3Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere,

nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.

4Nʼihi na nnagide anyị na-anagide

ịchị ọchị ndị nganga,

na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help