Ekiliziastis 8 - Igbo Contemporary Bible 2020

1Onye dị ka onye amamihe?

Onye maara nkọwa ihe?

Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe,

na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee.

Rubere eze isi

2Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.

3Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya.

4Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?

5Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu.

Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe.

6Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa,

ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya.

7Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime,

onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime?

8Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ mgbe ọ chọrọ.

Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya.

Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha,

otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ.

9Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu.

10Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu.

11Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie.

12Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke.

13Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo.

14Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi.

15Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ.

16Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị,

17mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help