Job 26 - Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu Job

1Mgbe ahụ, Job zaghachiri:

2“Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka!

Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!

3Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe!

Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.

4Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a?

Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?

5“Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu,

ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.

6Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke;

mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya.

7Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu.

O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.

8Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,

ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.

9Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,

na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,

10O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,

ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.

11Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji,

tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.

12Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri;

ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.

13Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma;

aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.

14Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;

lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya!

Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help