1“Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.
Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m.
Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m,
asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’
2Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ
nye ndị na-enupu isi,
bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi
ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha,
3ndị na-anọgide na-akpasu m iwe
nʼihu m mgbe niile,
ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige,
nʼebe ịchụ aja eji brik wuo,
4ndị na-anọdụ nʼetiti ili,
ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche;
ndị na-eri anụ ezi,
ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha;
5ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso,
nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’
Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m.
Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.
6“Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị:
Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju.
E, aga m akwụghachi ha.
7Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche,
kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile.
Aga m akwụghachi ha nʼuju,
nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”
8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị
ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya,
nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’
otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m;
Agaghị m ebibicha ha niile.
9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta,
sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile.
Ndị m họpụtara ga-eketa ha,
ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.
10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ;
Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi,
na ndị m na-achọsi m ike.
11“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ,
ndị chezọrọ ugwu nsọ m,
ndị na-edozi tebul maka Ihuọma,
ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.
12Aga m eme ka unu zute mma agha;
unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu.
Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị;
mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị.
Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu,
họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.”
13Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“Ndị ohu m ga-eriju afọ,
ma unu ga-anọ agụụ,
akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ,
ma ha ga-aṅụ mmiri.
Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere,
ma ha ga-anọ nʼọṅụ.
14Ndị ohu m ga-abụ abụ
nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha,
ma unu ga-akwa akwa,
nʼihi ihe mgbu nke obi unu,
tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu.
15Unu ga-ahapụ aha unu
nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ;
nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu,
ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ.
16Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ,
ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu,
onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ
ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu.
Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga,
zokwa ha site nʼanya m.
Ụwa ọhụrụ na eluigwe ọhụrụ17“Nʼihi na lee, ana m eke
eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.
Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;
ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.
18Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ
nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,
nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ
ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.
19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,
nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;
a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,
maọbụ olu iti mkpu akwa.
20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu
ga-adị nʼebe ahụ ọzọ,
a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;
nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ
dị ka nwantakịrị;
a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ
dịka onye a bụrụ ọnụ.
21Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya;
ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.
22Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ,
maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie.
Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge
otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge.
Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ
nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta.
23Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ.
Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri,
ha na ụmụ ụmụ ha.
24Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha.
Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.
25Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe,
ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi,
ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja!
Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ,
maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.”
Ka Onyenwe anyị kwuru.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.