Abụ Ọma 59 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 59Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Devid. Abụ miktam nke eji olu abụ “E bibikwala,” abụ. Mgbe Sọl zipụrụ ndị ikom ka e chee ụlọ Devid nche nʼihi igbu ya.Ekpere maka nnapụta

1O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m,

chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m.

2Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe,

zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ.

3Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ!

Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m,

o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m.

4Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m.

Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m!

5Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile,

gị onye bụ Chineke nke Izrel,

kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ;

e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela

6Nʼanyasị, ha na-alaghachi,

na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta

mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.

7Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta,

okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha,

ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?”

8Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị;

ị na-akwa mba ndị a niile emo.

9O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị;

gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike.

10Chineke m, onye m tụkwasịrị obi.

Chineke ga-ebutere m ụzọ

mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.

11O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha,

ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu.

Were ike gị mee ka ha wagharịa,

wedakwaa ha nʼala.

12Ka e jide ha nʼime nganga ha,

nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta,

na nʼihi okwu ọnụ ha.

Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha,

13jiri iwe ọkụ repịa ha,

repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ.

Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa,

na Chineke na-achị Jekọb.

14Nʼanyasị ha na-alaghachi;

na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta,

mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.

15Ha na-awagharị na-achọ nri,

na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha.

16Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,

nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị;

ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,

ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.

17O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto;

gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,

Chineke m, onye m na-adabere.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help