Hosiya 2 - Igbo Contemporary Bible 2020

1“Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’

Ntaramahụhụ na nlọta

2“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,

nʼihi na ọ bụghị nwunye m,

mụ onwe m abụkwaghị di ya.

Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,

ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.

3Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,

aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.

Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara,

ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,

were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.

4Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,

nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.

5Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,

ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.

Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,

ndị na-enye m nri na mmiri,

ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’

6Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;

aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.

7Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha.

Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha.

Mgbe ahụ, ọ ga-asị,

‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m,

nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’

8Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,

na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,

na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile

nke o ji na-efe Baal.

9“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,

na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.

Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,

nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.

10Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya

nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,

ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.

11Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;

ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,

nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.

12Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,

nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;

aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,

anụ ọhịa ga-eripịa ha.

13Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile

bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,

ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,

pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,

ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

14“Nʼihi nke a, aga m arara ya,

duba ya nʼime ọzara,

jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.

15Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya,

gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya.

Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa,

nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.

16“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,

“Ị ga-akpọ m ‘Di m,’

ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.

17Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,

ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.

18Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,

meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ,

na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ.

Aga m emebi ngwa agha niile,

agha niile ga-akwụsịkwa.

Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.

19Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;

aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,

nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.

20Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.

Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.

21“Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,”

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

“M ga-azaghachi eluigwe,

ha ga-azaghachi ala.

22Ala ga-azaghachi ọka

na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv,

mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.

23Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ.

Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’

M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,’ ‘Unu bụ ndị nke m,’

Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help