Jọn Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Jọn bụ otu nʼime ndị ikom iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ Kraịst. Ihe o dere nʼakwụkwọ oziọma a bụ ihe na-egosi na Jisọs Kraịst bụ Chineke nʼezie, na ọ ghọrọ mmadụ nʼihi ịzọpụta ụmụ mmadụ. Akwụkwọ oziọma Jọn na-akọwara anyị ụdị ịhụnanya dị ukwuu Chineke nwere nʼebe mmadụ nọ. Ọ na-egosikwa anyị na ndụ ebighị ebi bụ nke mmadụ ahụ jiri obi ya kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.Usoro e si dee ya:Nkọwa mmalite banyere ụdịdị Jisọs Kraịst 1:1-18Ọrụ mmalite dị iche iche 1:19–4:54Ọrụ dị iche iche na Galili 5:1–10:42Jisọs esite nʼọnwụ kpọlite Lazarọs 11Mmalite ọgwụgwụ nke ọrụ Jisọs 12–13Ozizi dị iche iche nke Jisọs 14–17Ọnwụ na mbilite nʼọnwụ 18:1–20:10Ngosi dị iche iche 20:11–21:25