Job 32 - Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu Elihu

1Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume.

2Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke.

3Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.

4Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ.

5Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.

6Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị:

“Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara,

ma unu bụ ndị okenye;

ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ,

hapụ ịgwa unu ihe m maara.

7Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu;

ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’

8Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,

nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.

9Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,

ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.

10“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;

mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.

11Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu,

egere m ntị na ntụgharị uche unu,

oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.

12Egere m nnọọ unu ntị,

ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;

ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.

13Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe;

ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’

14Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m,

ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.

15“Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu;

ike okwu agwụla ha.

16M ga-echere, ugbu a ha deere duu,

ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?

17Mụ onwe m ga-ekwu uche m;

ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,

18nʼihi na okwu juru m ọnụ,

ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.

19Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama,

dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.

20Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike;

aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.

21Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide

maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.

22Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma,

Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help