Hosiya 3 - Igbo Contemporary Bible 2020

Hosiya na nwunye ya adịrịkwa na mma

1 Onyenwe anyị gwara m ọzọ, “Gakwuru nwanyị a na-akwa iko, nke na-emekwa enyi na-ezighị ezi, gosi ya ịhụnanya gị dịka Onyenwe anyị si hụ ndị Izrel nʼanya, nʼagbanyeghị na ha na-eso chi ndị ọzọ na-enwekwa mmasị dị ukwuu nʼachịcha nsọ e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee.”

2Nʼihi ya, eweere m ego ọlaọcha dị iri na ise, na otu ntụju ọka homa, na ọka balị zụta ya.

3Mgbe ahụ agwara m ya, “Mụ na gị ga-ebi ọtụtụ ụbọchị, ị gaghị agbakwa akwụna, maọbụ nwee nwoke ọbụla gị na ya ga-enwe mmekọ, otu a ka m ga-emekwa nʼebe ị nọ.”

4Nke a na-egosi na Izrel ga-anọ ogologo mgbe na-enweghị eze maọbụ onye ọchịchị. Ọ gaghị enwe ịchụ aja maọbụ nkume nsọ maọbụ efọọd maọbụ arụsị ezinaụlọ.

5Mgbe nke a gasịrị, Izrel ga-alọghachi, chọọ Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid bụ eze ha. Ha ga-ewere ịma jijiji bịakwute Onyenwe anyị, bịaghachitekwa ngọzị ya nʼoge ikpeazụ a.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help