Abụ Ọma 100 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 100Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju.Toonu Chineke

1Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.

2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;

jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya

3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.

Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị,

anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.

4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya

jiri otuto baa nʼogige ya;

keleenụ ya, tookwa aha ya.

5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help