Abụ Ọma 47 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 47Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma.Chineke bụ eze nke ụwa

1Kụọnụ aka unu, unu mba niile;

jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.

2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu.

Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.

3O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;

ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.

4Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,

ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela

5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe.

Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.

6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;

bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.

7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.

Jirinụ abụ too ya.

8Chineke bụ eze mba niile;

ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.

9Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,

dịka ndị Chineke nke Ebraham,

nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke;

ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help