Ekiliziastis Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:Ihe e dere nʼakwụkwọ a na-egosi anyị na onye ọbụla kpebiri ibi ndụ nke ịgbakụta Chineke azụ adịghị enwe udo nʼobi ya. E gosiri anyị na inweju akụnụba, na amamihe, na ihe ndị ọzọ niile na-eweta obi ụtọ ezughị inye mmadụ udo nʼobi. Ọ bụ naanị mgbe mmadụ sitere nʼịgbaso ihe ndị a bịakwute Chineke ka ọ ga-enwe obi ụtọ juru eju. Ọrụ dịrị mmadụ, dị ka akwụkwọ a si kọwaa ya, bụ ịtụ egwu Chineke na idebe ihe niile o nyere nʼiwu.Usoro e si dee ya:Enweghị isi nke ndụ mmadụ na-adị 1:1-11Ịdị ndụ abaghị uru 1:12–2:23Ndọgbu nʼọrụ na mmegbu 2:24–4:12Abaghị uru nke ihe dị iche iche 4:13–11:10Nchịkọta okwu: Tụọ egwu Chineke, debe iwu ya 12