Ọpụpụ Ihe dị nʼime ya - Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe dị nʼime yaIhe dị nʼime ya:E dere ihe dị nʼakwụkwọ Ọpụpụ maka ịkọwa otu ndị Izrel, ụmụ ụmụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb si ghọọ otu mba, na otu e si kpọọ Mosis ka ọ bụrụ onye ga-edu ndị a Chineke họpụtara nye onwe ya, inwere onwe ha site nʼọnọdụ ibu ndị ohu. A kọrọ akụkọ ihe ịrịbama niile Chineke mere site nʼaka Mosis, nke o ji mee ka Fero eze Ijipt, kwenye ka ụmụ Izrel si nʼIjipt pụta, ka ha malite ịga nʼala ahụ e kwere nkwa inye ha. A kọkwara otu ụmụ Izrel si gafee Osimiri Uhie, otu mmiri si rie ndị Ijipt na-achụ ha ọsọ, kọwaakwa otu ha si rute nʼugwu Saịnaị ebe Chineke nọ nye ha iwu iri ya, na otu Mosis si nata iwu dị iche iche nke e nyere maka iwu ụlọ nzute, na otu ụmụ Izrel si wuo ụlọ nzute ahụ.Usoro e si dee ya:Ọnọdụ ịbụ ohu nʼala Ijipt 1Ọmụmụ Mosis na ndụ ya 2:1–7:7Ihe otiti, Ngabiga, na Ọpụpụ 7:8–15:21Site nʼIjipt ruo nʼUgwu Saịnaị 15:22–24:18Iwu e nyere maka iwu ụlọ nzute 25:1–31:18Mmehie Izrel na ịdọ aka na ntị 32:1–35:3Owuwu ụlọ nzute 35:4–40:38