Abụ Ọma 85 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 85Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora.Ekpere maka ihuọma

1O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma;

i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.

2I gbagharala ajọ omume ndị gị,

kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela

3Ị kwụsịla iwe oke iwe gị,

I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.

4Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,

wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.

5Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe:

Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?

6Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ

ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?

7O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide,

nyekwa anyị nzọpụta gị.

8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu;

ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo,

ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.

9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya,

ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.

10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala;

ezi omume na udo esutula ọnụ.

11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta,

ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.

12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma,

ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.

13Ezi omume ga-aga nʼihu ya,

idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help