Abụ Ọma 16 - Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ Ọma 16Abụ miktam nke Devid.Ekpere maka iguzosi ike

1Chebe m, O Chineke,

nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.

2A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m,

e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”

3Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a,

“Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”

4Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.

Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara nye chi ndị a,

maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.

5 Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;

ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.

6Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;

nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.

7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;

ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.

8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.

Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.

9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;

aga m anọkwa nʼudo.

10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,

ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure.

11I gosila m ụzọ ndụ;

ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;

ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help